Native Bible

1 Kings 20:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, ọ sịrị ndị ozi Ben-Hadad, “Gwanụ onyenwe m, bụ eze, ‘M bụ odibo gị jikeere ime ihe niile ị buru ụzọ kwuo na m ga-enye gị. Ma ekwenyeghị m nʼozi nke ugboro abụọ a.’ ” Ndị ozi ahụ laghachiri kọọrọ Ben-Hadad ihe niile Ehab kwuru.

1 Kings 20:9 in English

1 Kings 20:9 · Berean Standard Bible

So Ahab answered the messengers of Ben-hadad, “Tell my lord the king, ‘All that you demanded of your servant the first time I will do, but this thing I cannot do.’” So the messengers departed and relayed the message to Ben-hadad.

Context

7Eze Izrel kpọrọ ndị okenye niile nke ala ahụ, sị ha, “Leenụ ugbu a, hụkwanụ otu nwoke a si achọ nsogbu. Mgbe o zitere m ozi inye ya ndị nwunye m, na ụmụ, na ọlaọcha m na ọlaedo m, ekwenyere m ya inye ya ihe ndị a.” 8Ndị okenye na ndị Izrel zara sị ya, “Aṅala ya ntị! Enyela ya ihe ọbụla.” 9Mgbe ahụ, ọ sịrị ndị ozi Ben-Hadad, “Gwanụ onyenwe m, bụ eze, ‘M bụ odibo gị jikeere ime ihe niile ị buru ụzọ kwuo na m ga-enye gị. Ma ekwenyeghị m nʼozi nke ugboro abụọ a.’ ” Ndị ozi ahụ laghachiri kọọrọ Ben-Hadad ihe niile Ehab kwuru. 10Ma Ben-Hadad zigakwaara Ehab ozi ọzọ sị, “Ka chi ndị a mesoo m mmeso,* otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na aja Sameria ga-afọdụ inye onye ọbụla nʼetiti ndị ikom m otu njuaka.” 11Ma eze Izrel zaghachiri, “Gwa ya, ‘Onye na-ebu agha na-anya isi naanị mgbe a lụchara agha, ọ bụghị tupu a lụọ agha.’ ”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.