Native Bible

1 Kings 20:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Eze Izrel kpọrọ ndị okenye niile nke ala ahụ, sị ha, “Leenụ ugbu a, hụkwanụ otu nwoke a si achọ nsogbu. Mgbe o zitere m ozi inye ya ndị nwunye m, na ụmụ, na ọlaọcha m na ọlaedo m, ekwenyere m ya inye ya ihe ndị a.”

1 Kings 20:7 in English

1 Kings 20:7 · Berean Standard Bible

Then the king of Israel summoned all the elders of the land and said, “Please take note and see that this man is looking for trouble, for when he demanded my wives, my children, my silver, and my gold, I did not deny him.”

Context

5Ngwangwa ndị ozi Ben-Hadad bịaghachiri zie Ehab ozi ọzọ sị ya, “Otu a ka Ben-Hadad sịrị, ‘Ọ bụ ezie na m ziteere gị ozi, sị, ọlaọcha gị na ọlaedo gị na ndị nwunye gị na ụmụ gị ka ị ga-enye m. 6Ma ugbu a, nʼoge dị ka nke a, echi, aga m ezite ndị ozi m ka ha bịa nyochaa ụlọ gị niile na ụlọ ndị ozi gị niile. Ihe ọbụla dị oke ọnụahịa nʼanya gị ka ha ga-ewere.’ ” 7Eze Izrel kpọrọ ndị okenye niile nke ala ahụ, sị ha, “Leenụ ugbu a, hụkwanụ otu nwoke a si achọ nsogbu. Mgbe o zitere m ozi inye ya ndị nwunye m, na ụmụ, na ọlaọcha m na ọlaedo m, ekwenyere m ya inye ya ihe ndị a.” 8Ndị okenye na ndị Izrel zara sị ya, “Aṅala ya ntị! Enyela ya ihe ọbụla.” 9Mgbe ahụ, ọ sịrị ndị ozi Ben-Hadad, “Gwanụ onyenwe m, bụ eze, ‘M bụ odibo gị jikeere ime ihe niile ị buru ụzọ kwuo na m ga-enye gị. Ma ekwenyeghị m nʼozi nke ugboro abụọ a.’ ” Ndị ozi ahụ laghachiri kọọrọ Ben-Hadad ihe niile Ehab kwuru.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.