Native Bible

1 Kings 20:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ngwangwa ndị ozi Ben-Hadad bịaghachiri zie Ehab ozi ọzọ sị ya, “Otu a ka Ben-Hadad sịrị, ‘Ọ bụ ezie na m ziteere gị ozi, sị, ọlaọcha gị na ọlaedo gị na ndị nwunye gị na ụmụ gị ka ị ga-enye m.

1 Kings 20:5 in English

1 Kings 20:5 · Berean Standard Bible

The messengers came back and said, “This is what Ben-hadad says: ‘I have sent to you to demand your silver, your gold, your wives, and your children.

Context

3‘Ọlaọcha na ọlaedo gị, nkem ka ha bụ, ndị nwunye gị na ụmụ gị, bụ ndị dị mma karịsịa nke m ka ha bụ.’ ” 4Ehab eze Izrel, zighachiri ozi sị, “Ọ dị mma, onyenwe m, mụ onwe m, na ihe niile m nwere bụ nke gị.” 5Ngwangwa ndị ozi Ben-Hadad bịaghachiri zie Ehab ozi ọzọ sị ya, “Otu a ka Ben-Hadad sịrị, ‘Ọ bụ ezie na m ziteere gị ozi, sị, ọlaọcha gị na ọlaedo gị na ndị nwunye gị na ụmụ gị ka ị ga-enye m. 6Ma ugbu a, nʼoge dị ka nke a, echi, aga m ezite ndị ozi m ka ha bịa nyochaa ụlọ gị niile na ụlọ ndị ozi gị niile. Ihe ọbụla dị oke ọnụahịa nʼanya gị ka ha ga-ewere.’ ” 7Eze Izrel kpọrọ ndị okenye niile nke ala ahụ, sị ha, “Leenụ ugbu a, hụkwanụ otu nwoke a si achọ nsogbu. Mgbe o zitere m ozi inye ya ndị nwunye m, na ụmụ, na ọlaọcha m na ọlaedo m, ekwenyere m ya inye ya ihe ndị a.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.