1 Ndị Eze 20:3
1 Kings 20:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
‘Ọlaọcha na ọlaedo gị, nkem ka ha bụ, ndị nwunye gị na ụmụ gị, bụ ndị dị mma karịsịa nke m ka ha bụ.’ ”
1 Kings 20:3 in English
1 Kings 20:3 · Berean Standard Bible
saying, “This is what Ben-hadad says:* ‘Your silver and gold are mine, and your best wives and children are mine!’”
Context
1Ugbu a, Ben-Hadad, bụ eze ndị Aram, chịkọtara ndị agha ya niile. Iri ndị eze atọ na abụọ sonyere ya, ha na ịnyịnya ha na ụgbọ agha ha. Ọ rịgooro nọchibido obodo Sameria buso ya agha. 2Mgbe ahụ, eze ndị Siria zigaara Ehab, eze Izrel ozi nʼime obodo sị ya, “otu a ka Ben-Hadad sịrị, 3‘Ọlaọcha na ọlaedo gị, nkem ka ha bụ, ndị nwunye gị na ụmụ gị, bụ ndị dị mma karịsịa nke m ka ha bụ.’ ” 4Ehab eze Izrel, zighachiri ozi sị, “Ọ dị mma, onyenwe m, mụ onwe m, na ihe niile m nwere bụ nke gị.” 5Ngwangwa ndị ozi Ben-Hadad bịaghachiri zie Ehab ozi ọzọ sị ya, “Otu a ka Ben-Hadad sịrị, ‘Ọ bụ ezie na m ziteere gị ozi, sị, ọlaọcha gị na ọlaedo gị na ndị nwunye gị na ụmụ gị ka ị ga-enye m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.