Native Bible

1 Kings 2:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ugbu a, enwere m otu ihe m na-arịọ nʼaka gị. Biko ajụkwala imere m ya.” Batsheba sịrị ya, “Gịnị bụ arịrịọ gị? Kwuo ihe ọ bụ.”

1 Kings 2:16 in English

1 Kings 2:16 · Berean Standard Bible

So now I have just one request of you; do not deny me.” “State your request,” she told him.

Context

14O kwuru sị, “O nwere ihe m nwere ịgwa gị.” Nne Solomọn zara sị ya, “Kwuo.” 15Ọ zara sị, “Dịka ị maara, ọ bụ m nwe alaeze a. Ndị Izrel niile lekwara anya na m ga-abụ eze ha. Ma otu ọ dị, ihe niile adịghịkwa ka ọ dị na mbụ, alaeze a aghọọla nke nwanne m, nʼihi na o si nʼaka Onyenwe anyị rute ya aka. 16Ugbu a, enwere m otu ihe m na-arịọ nʼaka gị. Biko ajụkwala imere m ya.” Batsheba sịrị ya, “Gịnị bụ arịrịọ gị? Kwuo ihe ọ bụ.” 17Ọ zaghachiri ya sị, “Biko rịọrọ m Solomọn eze, nʼihi na amaara m na ọ ga-eme ihe ọbụla ị rịọrọ ya, ka ọ kpọnye m Abishag, nwanyị Shunem ahụ, ka ọ bụrụ nwunye m.” 18Batsheba zara sị ya, “Ọ dị mma, aga m agwara gị eze okwu.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.