Native Bible

1 Kings 2:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ zaghachiri ya sị, “Biko rịọrọ m Solomọn eze, nʼihi na amaara m na ọ ga-eme ihe ọbụla ị rịọrọ ya, ka ọ kpọnye m Abishag, nwanyị Shunem ahụ, ka ọ bụrụ nwunye m.”

1 Kings 2:17 in English

1 Kings 2:17 · Berean Standard Bible

Adonijah replied, “Please speak to King Solomon, since he will not turn you down. Let him give me Abishag the Shunammite as my wife.”

Context

15Ọ zara sị, “Dịka ị maara, ọ bụ m nwe alaeze a. Ndị Izrel niile lekwara anya na m ga-abụ eze ha. Ma otu ọ dị, ihe niile adịghịkwa ka ọ dị na mbụ, alaeze a aghọọla nke nwanne m, nʼihi na o si nʼaka Onyenwe anyị rute ya aka. 16Ugbu a, enwere m otu ihe m na-arịọ nʼaka gị. Biko ajụkwala imere m ya.” Batsheba sịrị ya, “Gịnị bụ arịrịọ gị? Kwuo ihe ọ bụ.” 17Ọ zaghachiri ya sị, “Biko rịọrọ m Solomọn eze, nʼihi na amaara m na ọ ga-eme ihe ọbụla ị rịọrọ ya, ka ọ kpọnye m Abishag, nwanyị Shunem ahụ, ka ọ bụrụ nwunye m.” 18Batsheba zara sị ya, “Ọ dị mma, aga m agwara gị eze okwu.” 19Emesịa, Batsheba bịakwutere eze Solomọn ịgwa ya okwu banyere Adonaịja. Mgbe ọ na-abata, eze sitere nʼocheeze ya bilie gaa izute ya, kpọkwaa isiala nye ya nọdụ ala nʼocheeze ya. O mere ka e butere nne eze* ocheeze, ọ nọdụkwara ala nʼaka nri ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.