1 Ndị Eze 2:18
1 Kings 2:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Batsheba zara sị ya, “Ọ dị mma, aga m agwara gị eze okwu.”
1 Kings 2:18 in English
1 Kings 2:18 · Berean Standard Bible
“Very well,” Bathsheba replied. “I will speak to the king for you.”
Context
16Ugbu a, enwere m otu ihe m na-arịọ nʼaka gị. Biko ajụkwala imere m ya.”
Batsheba sịrị ya, “Gịnị bụ arịrịọ gị? Kwuo ihe ọ bụ.” 17Ọ zaghachiri ya sị, “Biko rịọrọ m Solomọn eze, nʼihi na amaara m na ọ ga-eme ihe ọbụla ị rịọrọ ya, ka ọ kpọnye m Abishag, nwanyị Shunem ahụ, ka ọ bụrụ nwunye m.” 18Batsheba zara sị ya, “Ọ dị mma, aga m agwara gị eze okwu.” 19Emesịa, Batsheba bịakwutere eze Solomọn ịgwa ya okwu banyere Adonaịja. Mgbe ọ na-abata, eze sitere nʼocheeze ya bilie gaa izute ya, kpọkwaa isiala nye ya nọdụ ala nʼocheeze ya. O mere ka e butere nne eze* ocheeze, ọ nọdụkwara ala nʼaka nri ya. 20Ọ sịrị, “Enwere m arịrịọ nta m chọrọ ịrịọ gị. Ajụkwala i mere m ya.”
Eze zaghachiri, “Rịọọ ya nne m. Agaghị m ajụ i mere gị ya.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.