1 Ndị Kọrint 3:21
1 Corinthians 3:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi nke a, ka onye ọbụla ghara ịnya isi banyere mmadụ. Ihe niile bụ nke gị.
1 Corinthians 3:21 in English
1 Corinthians 3:21 · Berean Standard Bible
Therefore, stop boasting in men. All things are yours,
Context
19Nʼihi na ihe ahụ ụwa na-eche na ọ bụ ezi ịma ihe bụ nzuzu nʼanya Chineke. Nʼihi na e dere ya, “Ọ na-ejide ndị oke amamihe nʼaghụghọ ha niile.”* 20Ọzọkwa, “Onyenwe anyị maara echiche obi mmadụ, mara na amamihe ya bụ ihe efu.”* 21Nʼihi nke a, ka onye ọbụla ghara ịnya isi banyere mmadụ. Ihe niile bụ nke gị. 22Ma ọ bụ Pọl, maọbụ Apọlọs, maọbụ Sefas, maọbụ ụwa a, maọbụ ndụ, maọbụ ọnwụ, maọbụ ihe dị taa na ihe niile ga-adị nʼoge dị nʼihu, ha bụ nke unu. 23Unu bụkwa nke Kraịst, Kraịst bụkwa nke Chineke.
3:19 Job 5:13
3:20 Abụ 94:11
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.