1 Ndị Kọrint 3:19
1 Corinthians 3:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na ihe ahụ ụwa na-eche na ọ bụ ezi ịma ihe bụ nzuzu nʼanya Chineke. Nʼihi na e dere ya, “Ọ na-ejide ndị oke amamihe nʼaghụghọ ha niile.”*
1 Corinthians 3:19 in English
1 Corinthians 3:19 · Berean Standard Bible
For the wisdom of this world is foolishness in God’s sight. As it is written: “He catches the wise in their craftiness.”*
Context
17Ọ bụrụ na onye ọbụla emebie ụlọnsọ Chineke, Chineke ga-emebikwa onye ahụ. Nʼihi na ụlọ Chineke bụ ụlọ dị nsọ, unu bụkwa ụlọ ahụ. 18Ka onye o bụla ghara ịghọgbu onwe ya, ọ bụrụ na onye ọbụla nʼime unu na-eche nʼobi ya na ya bụ onye maara ihe, dịka ihe ọmụma nke ụwa si dị, ọ ga-akara onye ahụ mma ime onwe ya onye nzuzu, ka o nwe ike bụrụ onye maara ihe. 19Nʼihi na ihe ahụ ụwa na-eche na ọ bụ ezi ịma ihe bụ nzuzu nʼanya Chineke. Nʼihi na e dere ya, “Ọ na-ejide ndị oke amamihe nʼaghụghọ ha niile.”* 20Ọzọkwa, “Onyenwe anyị maara echiche obi mmadụ, mara na amamihe ya bụ ihe efu.”* 21Nʼihi nke a, ka onye ọbụla ghara ịnya isi banyere mmadụ. Ihe niile bụ nke gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.