1 Ihe E Mere 5:17
1 Chronicles 5:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
E denyere aha ndị a niile nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ nʼoge Jotam bụ eze Juda, na nʼoge Jeroboam bụ eze Izrel.
1 Chronicles 5:17 in English
1 Chronicles 5:17 · Berean Standard Bible
All of them were reckoned in the genealogies during the reigns of Jotham king of Judah and Jeroboam king of Israel.
Context
15Ahi nwa Abdiel, nwa Guni bụ onyeisi nʼetiti ụmụnna ya. 16Ndị Gad nwere ebe obibi na Gilead nʼime Bashan, na nʼobodo nta niile gbara ya gburugburu. Ha bikwa nʼebe ahịhịa anụ ụlọ na-ata jupụtara na Sharọn ruo nʼebe oke ala ha kwụsịrị. 17E denyere aha ndị a niile nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ nʼoge Jotam bụ eze Juda, na nʼoge Jeroboam bụ eze Izrel. 18Ndị Ruben na ndị Gad, na ọkara ebo Manase nwere iri puku mmadụ anọ na anọ na narị asaa na iri isii (44,760) ndị jikeere ije agha, ndị dị ike, ndị a zụrụ iji ọta na mma agha, na ụta ibu agha. 19Ha busoro ndị Haga, na Jetua, na Nafish na ndị Nodab agha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.