Native Bible

1 Chronicles 5:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị Gad nwere ebe obibi na Gilead nʼime Bashan, na nʼobodo nta niile gbara ya gburugburu. Ha bikwa nʼebe ahịhịa anụ ụlọ na-ata jupụtara na Sharọn ruo nʼebe oke ala ha kwụsịrị.

1 Chronicles 5:16 in English

1 Chronicles 5:16 · Berean Standard Bible

They lived in Gilead, in Bashan and its towns, and throughout the pasturelands of Sharon.

Context

14Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Abihail, nwa Huri, nwa Jaroa, nwa Gilead, nwa Maikel, nwa Jehishai, nwa Jado, nwa Buz. 15Ahi nwa Abdiel, nwa Guni bụ onyeisi nʼetiti ụmụnna ya. 16Ndị Gad nwere ebe obibi na Gilead nʼime Bashan, na nʼobodo nta niile gbara ya gburugburu. Ha bikwa nʼebe ahịhịa anụ ụlọ na-ata jupụtara na Sharọn ruo nʼebe oke ala ha kwụsịrị. 17E denyere aha ndị a niile nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ nʼoge Jotam bụ eze Juda, na nʼoge Jeroboam bụ eze Izrel. 18Ndị Ruben na ndị Gad, na ọkara ebo Manase nwere iri puku mmadụ anọ na anọ na narị asaa na iri isii (44,760) ndị jikeere ije agha, ndị dị ike, ndị a zụrụ iji ọta na mma agha, na ụta ibu agha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.