Native Bible

1 Chronicles 5:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha busoro ndị Haga, na Jetua, na Nafish na ndị Nodab agha.

1 Chronicles 5:19 in English

1 Chronicles 5:19 · Berean Standard Bible

They waged war against the Hagrites, as well as Jetur, Naphish, and Nodab.

Context

17E denyere aha ndị a niile nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ nʼoge Jotam bụ eze Juda, na nʼoge Jeroboam bụ eze Izrel. 18Ndị Ruben na ndị Gad, na ọkara ebo Manase nwere iri puku mmadụ anọ na anọ na narị asaa na iri isii (44,760) ndị jikeere ije agha, ndị dị ike, ndị a zụrụ iji ọta na mma agha, na ụta ibu agha. 19Ha busoro ndị Haga, na Jetua, na Nafish na ndị Nodab agha. 20E nyeere ha aka ibuso ha agha, Chineke nyefere ndị Haga na ndị niile na-enyere ha aka nʼaka ha, nʼihi na ha kpọkuru ya nʼoge ọgụ ahụ. Ọ zara ekpere ha nʼihi na ha tụkwasịrị ya obi. 21Ha ji ike chịkọrọ anụ ụlọ ndị Haga, dị iri puku ịnyịnya kamel ise, narị puku atụrụ abụọ na iri puku ise, puku ịnyịnya ibu abụọ. Ha dọkpụkwara narị puku ndị mmadụ nʼagha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.