1 Ihe E Mere 5:11
1 Chronicles 5:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụmụ Gad bi nʼakụkụ ha site na Bashan ruo Saleka.
1 Chronicles 5:11 in English
1 Chronicles 5:11 · Berean Standard Bible
The descendants of Gad lived next to the Reubenites in the land of Bashan, as far as Salecah:
Context
9Ha bụ ndị ọzụzụ atụrụ, nwekwa ọtụtụ igwe anụ ụlọ. Ọ bụkwa nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, nʼọnụ ọzara ruo nʼosimiri Yufretis ka ha na-azụ ha, nʼihi na anụ ụlọ ha nwere bara ụba na Gilead. 10Nʼoge Sọl bụ eze Izrel, ụmụ Ruben meriri ndị Haga nʼagha, bichie ala ha niile dị nʼọwụwa anyanwụ Gilead. 11Ụmụ Gad bi nʼakụkụ ha site na Bashan ruo Saleka. 12Juel bụ onyendu na Bashan, Shafam na-esote ya, ya na Janai na Shafat. 13Ụmụnna ha, ndị bụ ndị ndu ikwu asaa a bụ,
Maikel, na Meshulam, na Sheba, na Jorai, na Jakan, na Zia, na Eba.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.