1 Ihe E Mere 5:10
1 Chronicles 5:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼoge Sọl bụ eze Izrel, ụmụ Ruben meriri ndị Haga nʼagha, bichie ala ha niile dị nʼọwụwa anyanwụ Gilead.
1 Chronicles 5:10 in English
1 Chronicles 5:10 · Berean Standard Bible
During the days of Saul they waged war against the Hagrites, who were defeated at their hands, and they occupied the homes of the Hagrites throughout the region east of Gilead.
Context
8na Bela nwa Azaz nwa Shema, nwa Juel.
Ha nwere ebe obibi ha site nʼAroea ruo nʼugwu Nebo, rukwaa Baal-Meon. 9Ha bụ ndị ọzụzụ atụrụ, nwekwa ọtụtụ igwe anụ ụlọ. Ọ bụkwa nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, nʼọnụ ọzara ruo nʼosimiri Yufretis ka ha na-azụ ha, nʼihi na anụ ụlọ ha nwere bara ụba na Gilead. 10Nʼoge Sọl bụ eze Izrel, ụmụ Ruben meriri ndị Haga nʼagha, bichie ala ha niile dị nʼọwụwa anyanwụ Gilead. 11Ụmụ Gad bi nʼakụkụ ha site na Bashan ruo Saleka. 12Juel bụ onyendu na Bashan, Shafam na-esote ya, ya na Janai na Shafat.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.