Native Bible

1 Chronicles 16:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ịma mma na ebube dị nʼihu ya; ike na ọṅụ dị nʼebe obibi ya.

1 Chronicles 16:27 in English

1 Chronicles 16:27 · Berean Standard Bible

Splendor and majesty are before Him; strength and joy fill His dwelling.

Context

25Nʼihi na Onyenwe anyị dị ukwuu, ọ bụkwa onye kachasị ka e nye otuto. Onye a na-atụ egwu karịa chi ọzọ niile ka ọ bụkwa. 26Nʼihi na chi niile nke mba niile dị iche iche bụ arụsị efu, maọbụ Onyenwe anyị kere eluigwe niile. 27Ịma mma na ebube dị nʼihu ya; ike na ọṅụ dị nʼebe obibi ya. 28Nyenụ Onyenwe anyị, unu ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche, nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ na ike. 29E, nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ ruuru aha ya, werenụ onyinye bịa nʼihu ya. Kpọọnụ isiala nye Onyenwe anyị nʼịma mma nke ịdị nsọ ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.