Native Bible

1 Chronicles 16:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na chi niile nke mba niile dị iche iche bụ arụsị efu, maọbụ Onyenwe anyị kere eluigwe niile.

1 Chronicles 16:26 in English

1 Chronicles 16:26 · Berean Standard Bible

For all the gods of the nations are idols, but it is the LORD who made the heavens.

Context

24Kwusaanụ ebube ya nʼetiti mba niile, kọsakwanụ banyere oke ọrụ ya niile nʼetiti ndị niile dị iche iche. 25Nʼihi na Onyenwe anyị dị ukwuu, ọ bụkwa onye kachasị ka e nye otuto. Onye a na-atụ egwu karịa chi ọzọ niile ka ọ bụkwa. 26Nʼihi na chi niile nke mba niile dị iche iche bụ arụsị efu, maọbụ Onyenwe anyị kere eluigwe niile. 27Ịma mma na ebube dị nʼihu ya; ike na ọṅụ dị nʼebe obibi ya. 28Nyenụ Onyenwe anyị, unu ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche, nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ na ike.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.