Native Bible

1 Chronicles 16:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ṅụrianụ nʼime aha nsọ ya; ka obi ndị niile na-achọ Onyenwe anyị ṅụrịa ọṅụ.

1 Chronicles 16:10 in English

1 Chronicles 16:10 · Berean Standard Bible

Glory in His holy name; let the hearts of those who seek the LORD rejoice.

Context

8Nyenụ Onyenwe anyị otuto, kwupụtakwa aha ya, meenụ ka amata nʼetiti mba niile banyere ihe niile ọ rụrụ. 9Bụkuonụ ya abụ, bụkuonụ ya abụ otuto; kwupụtaranụ mba niile ọrụ ebube ya niile. 10Ṅụrianụ nʼime aha nsọ ya; ka obi ndị niile na-achọ Onyenwe anyị ṅụrịa ọṅụ. 11Na-achọnụ Onyenwe anyị na ike ya, chọọnụ ihu ya mgbe niile. 12Chetanụ ọrụ ebube niile nke ọ rụrụ, ihe ịrịbama ya niile na ikpe ziri ezi niile nke si nʼọnụ ya pụta.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.