Native Bible

1 Chronicles 15:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, Devid kpọkọtara ndị Izrel niile, na Jerusalem ibubata igbe Onyenwe anyị nʼebe ahụ ọ kwadoro na a ga-adọsa ya.

1 Chronicles 15:3 in English

1 Chronicles 15:3 · Berean Standard Bible

And David assembled all Israel in Jerusalem to bring up the ark of the LORD to the place he had prepared for it.

Context

1Mgbe Devid wuchara ụlọ obibi ya nʼobodo Devid, o doziri ebe a ga-adọsa igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Ọ mara ụlọ ikwu maka ya. 2Devid kwuru sị, “O nweghị onye ọbụla ga-ebu igbe Chineke karịakwa ndị Livayị, nʼihi na Onyenwe anyị họpụtara ha ibu igbe Onyenwe anyị na ije ozi nʼihu Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi.” 3Ya mere, Devid kpọkọtara ndị Izrel niile, na Jerusalem ibubata igbe Onyenwe anyị nʼebe ahụ ọ kwadoro na a ga-adọsa ya. 4Ọ kpọkọtara ụmụ Erọn na ndị Livayị: 5Ndị Kohat na ụmụnna ha dị otu narị na iri abụọ. (120) Uriel bụ onyeisi ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.