1 Ihe E Mere 12:31
1 Chronicles 12:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Site nʼọkara ebo Manase, ndị ọnụọgụgụ ha dị puku iri na asatọ (18,000) ka a họpụtara ịga inyere Devid aka ịbụ eze.
1 Chronicles 12:31 in English
1 Chronicles 12:31 · Berean Standard Bible
From the half-tribe of Manasseh:* 18,000 designated by name to come and make David king.
Context
29Ụmụ Benjamin, ndị ikwu Sọl, dị puku atọ (3,000), nʼihi na nʼoge a, ọtụtụ ha nọnyeere Sọl. 30Ụmụ Ifrem dị iri puku abụọ na narị asatọ (20,800), ndị dị ike nʼagha, ndị a makwaara aha ha nʼikwu ha. 31Site nʼọkara ebo Manase, ndị ọnụọgụgụ ha dị puku iri na asatọ (18,000) ka a họpụtara ịga inyere Devid aka ịbụ eze. 32Ụmụ Isaka; narị ndịisi abụọ (200), na ndị ha na-edu. Ndịisi a bụ ndị nwere nghọta oge ha nọ nʼime ya marakwa ihe Izrel kwesiri ime nʼoge ahụ. 33Ụmụ Zebụlọn dị iri puku ise. (50,000) Ha enweghị obi abụọ ọbụla iso Devid. A zụkwara ha nʼiji ụdị ngwa agha ọbụla na-ebu agha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.