1 Ihe E Mere 12:32
1 Chronicles 12:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụmụ Isaka; narị ndịisi abụọ (200), na ndị ha na-edu. Ndịisi a bụ ndị nwere nghọta oge ha nọ nʼime ya marakwa ihe Izrel kwesiri ime nʼoge ahụ.
1 Chronicles 12:32 in English
1 Chronicles 12:32 · Berean Standard Bible
From Issachar, men who understood the times and knew what Israel should do: 200 chiefs with all their kinsmen at their command.
Context
30Ụmụ Ifrem dị iri puku abụọ na narị asatọ (20,800), ndị dị ike nʼagha, ndị a makwaara aha ha nʼikwu ha. 31Site nʼọkara ebo Manase, ndị ọnụọgụgụ ha dị puku iri na asatọ (18,000) ka a họpụtara ịga inyere Devid aka ịbụ eze. 32Ụmụ Isaka; narị ndịisi abụọ (200), na ndị ha na-edu. Ndịisi a bụ ndị nwere nghọta oge ha nọ nʼime ya marakwa ihe Izrel kwesiri ime nʼoge ahụ. 33Ụmụ Zebụlọn dị iri puku ise. (50,000) Ha enweghị obi abụọ ọbụla iso Devid. A zụkwara ha nʼiji ụdị ngwa agha ọbụla na-ebu agha. 34Ọnụọgụgụ ndị ndu ụmụ Naftalị dị otu puku (1,000), tinyere ndị agha dị puku iri atọ na asaa (37,000), ndị ji ùbe na ọta.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.