Native Bible

1 Chronicles 12:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ụmụ Ifrem dị iri puku abụọ na narị asatọ (20,800), ndị dị ike nʼagha, ndị a makwaara aha ha nʼikwu ha.

1 Chronicles 12:30 in English

1 Chronicles 12:30 · Berean Standard Bible

From Ephraim: 20,800 mighty men of valor, famous among their own clans.

Context

28na Zadọk, nwokorobịa bụ dike na dimkpa nʼagha, onyendu ndịisi agha iri abụọ na abụọ (22) ndị si nʼezinaụlọ ya. 29Ụmụ Benjamin, ndị ikwu Sọl, dị puku atọ (3,000), nʼihi na nʼoge a, ọtụtụ ha nọnyeere Sọl. 30Ụmụ Ifrem dị iri puku abụọ na narị asatọ (20,800), ndị dị ike nʼagha, ndị a makwaara aha ha nʼikwu ha. 31Site nʼọkara ebo Manase, ndị ọnụọgụgụ ha dị puku iri na asatọ (18,000) ka a họpụtara ịga inyere Devid aka ịbụ eze. 32Ụmụ Isaka; narị ndịisi abụọ (200), na ndị ha na-edu. Ndịisi a bụ ndị nwere nghọta oge ha nọ nʼime ya marakwa ihe Izrel kwesiri ime nʼoge ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.