Native Bible

1 Chronicles 12:33 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ụmụ Zebụlọn dị iri puku ise. (50,000) Ha enweghị obi abụọ ọbụla iso Devid. A zụkwara ha nʼiji ụdị ngwa agha ọbụla na-ebu agha.

1 Chronicles 12:33 in English

1 Chronicles 12:33 · Berean Standard Bible

From Zebulun: 50,000 fit for service, trained for battle with all kinds of weapons of war, who with one purpose were devoted to David.*

Context

31Site nʼọkara ebo Manase, ndị ọnụọgụgụ ha dị puku iri na asatọ (18,000) ka a họpụtara ịga inyere Devid aka ịbụ eze. 32Ụmụ Isaka; narị ndịisi abụọ (200), na ndị ha na-edu. Ndịisi a bụ ndị nwere nghọta oge ha nọ nʼime ya marakwa ihe Izrel kwesiri ime nʼoge ahụ. 33Ụmụ Zebụlọn dị iri puku ise. (50,000) Ha enweghị obi abụọ ọbụla iso Devid. A zụkwara ha nʼiji ụdị ngwa agha ọbụla na-ebu agha. 34Ọnụọgụgụ ndị ndu ụmụ Naftalị dị otu puku (1,000), tinyere ndị agha dị puku iri atọ na asaa (37,000), ndị ji ùbe na ọta. 35Ụmụ Dan dị iri puku abụọ na asatọ, na narị isii. (28,600) Ha bụkwa ndị agha jikeere ibu agha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.