Zefanaya 3:2
Zephaniah 3:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ naghị ege onye ọbụla ntị, ọ dịghị anabata ịdọ aka na ntị. Ọ dịghị atụkwasị Onyenwe anyị obi, ọ dịkwaghị abịakwute Chineke ya nso.
Zephaniah 3:2 in English
Zephaniah 3:2 · Berean Standard Bible
She heeded no voice; she accepted no correction. She does not trust in the LORD; she has not drawn near to her God.
Context
1Ahụhụ dịrị obodo ahụ ndị mmegbu,
na ndị na-enupu isi, na ndị rụrụ arụ jupụtara nʼime ya. 2Ọ naghị ege onye ọbụla ntị,
ọ dịghị anabata ịdọ aka na ntị.
Ọ dịghị atụkwasị Onyenwe anyị obi,
ọ dịkwaghị abịakwute Chineke ya nso. 3Ndịisi nọ nʼetiti ya
dịka ọdụm na-agbọ ụja,
ndị ọkaikpe ya dịka nkịta ọhịa na-achụ nta anyasị,
nke ihe ọ chụtara na nta adịghị anọ tutu chi abọọ. 4Ndị amụma ya bụ ndị ndu rụrụ arụ,
ha bụkwa ndị aghụghọ.
Ndị nchụaja ya na-emerụ ebe nsọ
na-ejikwa ike emebi iwu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.