Zefanaya 3:1
Zephaniah 3:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ahụhụ dịrị obodo ahụ ndị mmegbu, na ndị na-enupu isi, na ndị rụrụ arụ jupụtara nʼime ya.
Zephaniah 3:1 in English
Zephaniah 3:1 · Berean Standard Bible
Woe to the city of oppressors, rebellious and defiled!
Context
1Ahụhụ dịrị obodo ahụ ndị mmegbu,
na ndị na-enupu isi, na ndị rụrụ arụ jupụtara nʼime ya. 2Ọ naghị ege onye ọbụla ntị,
ọ dịghị anabata ịdọ aka na ntị.
Ọ dịghị atụkwasị Onyenwe anyị obi,
ọ dịkwaghị abịakwute Chineke ya nso. 3Ndịisi nọ nʼetiti ya
dịka ọdụm na-agbọ ụja,
ndị ọkaikpe ya dịka nkịta ọhịa na-achụ nta anyasị,
nke ihe ọ chụtara na nta adịghị anọ tutu chi abọọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.