Zefanaya 3:4
Zephaniah 3:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị amụma ya bụ ndị ndu rụrụ arụ, ha bụkwa ndị aghụghọ. Ndị nchụaja ya na-emerụ ebe nsọ na-ejikwa ike emebi iwu.
Zephaniah 3:4 in English
Zephaniah 3:4 · Berean Standard Bible
Her prophets are reckless, faithless men. Her priests profane the sanctuary; they do violence to the law.
Context
2Ọ naghị ege onye ọbụla ntị,
ọ dịghị anabata ịdọ aka na ntị.
Ọ dịghị atụkwasị Onyenwe anyị obi,
ọ dịkwaghị abịakwute Chineke ya nso. 3Ndịisi nọ nʼetiti ya
dịka ọdụm na-agbọ ụja,
ndị ọkaikpe ya dịka nkịta ọhịa na-achụ nta anyasị,
nke ihe ọ chụtara na nta adịghị anọ tutu chi abọọ. 4Ndị amụma ya bụ ndị ndu rụrụ arụ,
ha bụkwa ndị aghụghọ.
Ndị nchụaja ya na-emerụ ebe nsọ
na-ejikwa ike emebi iwu. 5Ma Onyenwe anyị, onye nọ nʼetiti ya bụ onye ezi omume.
Ọ nakwaghị eme ihe ọjọọ.*
Ụtụtụ niile ka ọ na-eme ka ikpe ziri ezi ya pụta ìhè;
ụbọchị ọbụla ọ naghị ahapụ igosi ya,
ma ndị ajọ omume enweghị ihere. 6“Egbuchapụla m mba niile dị iche iche,
kwatukwaa ebe ha niile e wusiri ike.
Ahapụla m okporoụzọ ha ka ọ bụrụ ihe a gbahapụrụ agbahapụ,*
ọ dịkwaghị onye na-esi na ha agabiga.
A laala obodo ha niile nʼiyi,
ọ dịkwaghị onye fọdụrụ, ọ bụladị otu onye.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.