Zefanaya 2:6
Zephaniah 2:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ala nke dị nʼakụkụ oke osimiri ahụ, ga-aghọ ebe ahịhịa jupụtara nye ndị ọzụzụ atụrụ na ọgba igwe ewu na atụrụ.
Zephaniah 2:6 in English
Zephaniah 2:6 · Berean Standard Bible
So the seacoast will become a land of pastures, with wells * for shepherds and folds for sheep.
Context
4Nʼihi na o nwekwaghị ndị ga-ebi nʼobodo Gaza,
obodo Ashkelọn ga-atọgbọrọ nʼefu.
Nʼetiti ehihie ka a ga-ekpochapụ ndị niile bi nʼAshdọd;
a ga-ehopukwa Ekrọn. 5Ahụhụ dịrị unu ndị bi nʼakụkụ oke osimiri,
unu bụ ndị Keret;
okwu Onyenwe anyị na-emegide unu,
Kenan, ala ndị Filistia.
Ọ sịrị, “Aga m ala gị nʼiyi,
ruo na ọ dịghị onye ga-afọdụ ndụ nʼime gị.” 6Ala nke dị nʼakụkụ oke osimiri ahụ,
ga-aghọ ebe ahịhịa jupụtara nye ndị ọzụzụ atụrụ
na ọgba igwe ewu na atụrụ. 7Ala nke dị nʼakụkụ oke osimiri
ga-aghọ ala nke ndị ahụ fọdụrụ na Juda,
ebe ha ga-achọtara anụ ụlọ ha ahịhịa.
Ha ga-anọkwa nʼụlọ ndị Ashkelọn nke tọgbọrọ nʼefu,
dinaa ala zuru ike nʼoge uhuruchi.
Onyenwe anyị Chineke ha ga-elekọta ha,
mekwaa ka ha nwetaghachi ihe nketa ha niile. 8“Anụla m okwu ọjọọ niile, nke ndị Moab,
na ịkwa emo niile nke ndị Amọn,
nụkwa ịbasị mba ike ha megide ndị nke m
na-anya isi na ha ga-ewere ala ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.