Zefanaya 2:5
Zephaniah 2:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ahụhụ dịrị unu ndị bi nʼakụkụ oke osimiri, unu bụ ndị Keret; okwu Onyenwe anyị na-emegide unu, Kenan, ala ndị Filistia. Ọ sịrị, “Aga m ala gị nʼiyi, ruo na ọ dịghị onye ga-afọdụ ndụ nʼime gị.”
Zephaniah 2:5 in English
Zephaniah 2:5 · Berean Standard Bible
Woe to the dwellers of the seacoast, O nation of the Cherethites! The word of the LORD is against you, O Canaan, land of the Philistines: “I will destroy you, and no one will be left.”
Context
3Chọọnụ Onyenwe anyị, unu ndị niile dị umeala nʼobi nọ nʼala ahụ,
unu bụ ndị na-eme ihe o nyere nʼiwu.
Gbasoonụ ezi omume, gbasoonụ ịdị umeala nʼobi,
ma eleghị anya, a ga-echebe unu
nʼụbọchị iwe Onyenwe anyị. 4Nʼihi na o nwekwaghị ndị ga-ebi nʼobodo Gaza,
obodo Ashkelọn ga-atọgbọrọ nʼefu.
Nʼetiti ehihie ka a ga-ekpochapụ ndị niile bi nʼAshdọd;
a ga-ehopukwa Ekrọn. 5Ahụhụ dịrị unu ndị bi nʼakụkụ oke osimiri,
unu bụ ndị Keret;
okwu Onyenwe anyị na-emegide unu,
Kenan, ala ndị Filistia.
Ọ sịrị, “Aga m ala gị nʼiyi,
ruo na ọ dịghị onye ga-afọdụ ndụ nʼime gị.” 6Ala nke dị nʼakụkụ oke osimiri ahụ,
ga-aghọ ebe ahịhịa jupụtara nye ndị ọzụzụ atụrụ
na ọgba igwe ewu na atụrụ. 7Ala nke dị nʼakụkụ oke osimiri
ga-aghọ ala nke ndị ahụ fọdụrụ na Juda,
ebe ha ga-achọtara anụ ụlọ ha ahịhịa.
Ha ga-anọkwa nʼụlọ ndị Ashkelọn nke tọgbọrọ nʼefu,
dinaa ala zuru ike nʼoge uhuruchi.
Onyenwe anyị Chineke ha ga-elekọta ha,
mekwaa ka ha nwetaghachi ihe nketa ha niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.