Native Bible

Zephaniah 2:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na o nwekwaghị ndị ga-ebi nʼobodo Gaza, obodo Ashkelọn ga-atọgbọrọ nʼefu. Nʼetiti ehihie ka a ga-ekpochapụ ndị niile bi nʼAshdọd; a ga-ehopukwa Ekrọn.

Zephaniah 2:4 in English

Zephaniah 2:4 · Berean Standard Bible

For Gaza will be abandoned, and Ashkelon left in ruins. Ashdod will be driven out at noon, and Ekron will be uprooted.

Context

2Tupu ụkpụrụ ahụ ewere ọnọdụ, a chịpụ ụbọchị ahụ dịka igbugbo ọka nke ikuku na-ebufu, tupu iwe ọkụ Onyenwe anyị abịakwasị gị, tupu ụbọchị ọnụma nke Onyenwe anyị abịakwasị gị. 3Chọọnụ Onyenwe anyị, unu ndị niile dị umeala nʼobi nọ nʼala ahụ, unu bụ ndị na-eme ihe o nyere nʼiwu. Gbasoonụ ezi omume, gbasoonụ ịdị umeala nʼobi, ma eleghị anya, a ga-echebe unu nʼụbọchị iwe Onyenwe anyị. 4Nʼihi na o nwekwaghị ndị ga-ebi nʼobodo Gaza, obodo Ashkelọn ga-atọgbọrọ nʼefu. Nʼetiti ehihie ka a ga-ekpochapụ ndị niile bi nʼAshdọd; a ga-ehopukwa Ekrọn. 5Ahụhụ dịrị unu ndị bi nʼakụkụ oke osimiri, unu bụ ndị Keret; okwu Onyenwe anyị na-emegide unu, Kenan, ala ndị Filistia. Ọ sịrị, “Aga m ala gị nʼiyi, ruo na ọ dịghị onye ga-afọdụ ndụ nʼime gị.” 6Ala nke dị nʼakụkụ oke osimiri ahụ, ga-aghọ ebe ahịhịa jupụtara nye ndị ọzụzụ atụrụ na ọgba igwe ewu na atụrụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.