Native Bible

Zechariah 9:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼezie, lee ka ịdị mma nke ala ahụ si dị ukwuu! Leekwa ka ịma mma ya si dị ukwuu! Mkpụrụ ubi ga-eme ka ụmụ okorobịa tozuo oke nke ọma, mmanya vaịnị ọhụrụ ga-emekwa ka ụmụ agbọghọ doo ahụ.

Zechariah 9:17 in English

Zechariah 9:17 · Berean Standard Bible

How lovely they will be, and how beautiful! Grain will make the young men flourish, and new wine, the young women.

Context

15Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-echebe ha. Ha ga-ebibi, zọdakwa nkume ịtụ iche nʼebe niile. Ha ga-aṅụ ihe ọṅụṅụ mekwa mkpọtụ site na mmanya; ha ga-ejupụta dịka efere, dịka efere eji efesa ihe nʼakụkụ niile ebe a na-achụ aja na-ejupụta. 16Mgbe ụbọchị ahụ bịara, Onyenwe anyị bụ Chineke ha ga-azọpụta ndị ya, dịka onye ọzụzụ atụrụ si azọpụta igwe ewu na atụrụ ya. Ha ga-acha, na-egbuke nʼala ya, dịka nkume dị oke ọnụahịa e tinyere nʼokpueze si na-egbuke. 17Nʼezie, lee ka ịdị mma nke ala ahụ si dị ukwuu! Leekwa ka ịma mma ya si dị ukwuu! Mkpụrụ ubi ga-eme ka ụmụ okorobịa tozuo oke nke ọma, mmanya vaịnị ọhụrụ ga-emekwa ka ụmụ agbọghọ doo ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.