Zekaraya 9:16
Zechariah 9:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ụbọchị ahụ bịara, Onyenwe anyị bụ Chineke ha ga-azọpụta ndị ya, dịka onye ọzụzụ atụrụ si azọpụta igwe ewu na atụrụ ya. Ha ga-acha, na-egbuke nʼala ya, dịka nkume dị oke ọnụahịa e tinyere nʼokpueze si na-egbuke.
Zechariah 9:16 in English
Zechariah 9:16 · Berean Standard Bible
On that day the LORD their God will save them as the flock of His people; for like jewels in a crown they will sparkle over His land.
Context
14Mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-egosi onwe ya nʼebe dị elu karịa ha,
àkụ ya ga-efekwa dịka amụma.
Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-afụ opi ike,
ọ ga-azọkwa ije nʼoke ifufe nke si na ndịda. 15Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-echebe ha.
Ha ga-ebibi,
zọdakwa nkume ịtụ iche nʼebe niile.
Ha ga-aṅụ ihe ọṅụṅụ mekwa mkpọtụ site na mmanya;
ha ga-ejupụta dịka efere,
dịka efere eji efesa ihe nʼakụkụ niile ebe a na-achụ aja na-ejupụta. 16Mgbe ụbọchị ahụ bịara, Onyenwe anyị bụ Chineke ha ga-azọpụta ndị ya,
dịka onye ọzụzụ atụrụ si azọpụta igwe ewu na atụrụ ya.
Ha ga-acha, na-egbuke nʼala ya, dịka nkume dị oke ọnụahịa
e tinyere nʼokpueze si na-egbuke. 17Nʼezie, lee ka ịdị mma nke ala ahụ si dị ukwuu! Leekwa ka ịma mma ya si dị ukwuu!
Mkpụrụ ubi ga-eme ka ụmụ okorobịa tozuo oke nke ọma,
mmanya vaịnị ọhụrụ ga-emekwa ka ụmụ agbọghọ doo ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.