Native Bible

Zechariah 9:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-egosi onwe ya nʼebe dị elu karịa ha, àkụ ya ga-efekwa dịka amụma. Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-afụ opi ike, ọ ga-azọkwa ije nʼoke ifufe nke si na ndịda.

Zechariah 9:14 in English

Zechariah 9:14 · Berean Standard Bible

Then the LORD will appear over them, and His arrow will go forth like lightning. The Lord GOD will sound the ram’s horn and advance in the whirlwinds of the south.

Context

12Lọghachinụ nʼebe unu niile e wusiri ike, unu bụ ndị mkpọrọ nwere olileanya. Ọ bụladị taa, ana m ekwupụta ya na m ga-eme ka unu lọta, gọziekwa unu okpukpu abụọ. 13Aga m agbagọ Juda dịka m si ekwe ụta m, tinye Ifrem dịka àkụ. Aga m akwali ụmụ gị ndị ikom, gị Zayọn, ka ha megide ụmụ ndị ikom ndị Griis. Aga m eme gị ka ị dịrị ka mma agha dị nʼaka dike nʼagha. 14Mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-egosi onwe ya nʼebe dị elu karịa ha, àkụ ya ga-efekwa dịka amụma. Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-afụ opi ike, ọ ga-azọkwa ije nʼoke ifufe nke si na ndịda. 15Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-echebe ha. Ha ga-ebibi, zọdakwa nkume ịtụ iche nʼebe niile. Ha ga-aṅụ ihe ọṅụṅụ mekwa mkpọtụ site na mmanya; ha ga-ejupụta dịka efere, dịka efere eji efesa ihe nʼakụkụ niile ebe a na-achụ aja na-ejupụta. 16Mgbe ụbọchị ahụ bịara, Onyenwe anyị bụ Chineke ha ga-azọpụta ndị ya, dịka onye ọzụzụ atụrụ si azọpụta igwe ewu na atụrụ ya. Ha ga-acha, na-egbuke nʼala ya, dịka nkume dị oke ọnụahịa e tinyere nʼokpueze si na-egbuke.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.