Zekaraya 9:13
Zechariah 9:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m agbagọ Juda dịka m si ekwe ụta m, tinye Ifrem dịka àkụ. Aga m akwali ụmụ gị ndị ikom, gị Zayọn, ka ha megide ụmụ ndị ikom ndị Griis. Aga m eme gị ka ị dịrị ka mma agha dị nʼaka dike nʼagha.
Zechariah 9:13 in English
Zechariah 9:13 · Berean Standard Bible
For I will bend Judah as My bow and fit it with Ephraim. I will rouse your sons, O Zion, against the sons of Greece.* I will make you like the sword of a mighty man.
Context
11Ma gị onwe gị kwa, aga m eme ka ndị a tụrụ mkpọrọ nʼolulu nke mmiri na-adịghị nwere onwe ha,
nʼihi ọbara nke ọgbụgba ndụ ahụ mụ na unu gbara. 12Lọghachinụ nʼebe unu niile e wusiri ike, unu bụ ndị mkpọrọ nwere olileanya.
Ọ bụladị taa, ana m ekwupụta ya na m ga-eme ka unu lọta, gọziekwa unu okpukpu abụọ. 13Aga m agbagọ Juda dịka m si ekwe ụta m,
tinye Ifrem dịka àkụ.
Aga m akwali ụmụ gị ndị ikom, gị Zayọn,
ka ha megide ụmụ ndị ikom ndị Griis.
Aga m eme gị ka ị dịrị ka mma agha dị nʼaka dike nʼagha. 14Mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-egosi onwe ya nʼebe dị elu karịa ha,
àkụ ya ga-efekwa dịka amụma.
Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-afụ opi ike,
ọ ga-azọkwa ije nʼoke ifufe nke si na ndịda. 15Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-echebe ha.
Ha ga-ebibi,
zọdakwa nkume ịtụ iche nʼebe niile.
Ha ga-aṅụ ihe ọṅụṅụ mekwa mkpọtụ site na mmanya;
ha ga-ejupụta dịka efere,
dịka efere eji efesa ihe nʼakụkụ niile ebe a na-achụ aja na-ejupụta.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.