Zekaraya 9:11
Zechariah 9:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma gị onwe gị kwa, aga m eme ka ndị a tụrụ mkpọrọ nʼolulu nke mmiri na-adịghị nwere onwe ha, nʼihi ọbara nke ọgbụgba ndụ ahụ mụ na unu gbara.
Zechariah 9:11 in English
Zechariah 9:11 · Berean Standard Bible
As for you, because of the blood of My covenant, I will release your prisoners from the waterless pit.
Context
9Ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu, gị Ada Zayọn!
Tie mkpu ọṅụ, gị Ada Jerusalem!
Nʼihi na lee, eze gị na-abịakwute gị,
onye ezi omume na onye nwere mmeri,
onye ewedara nʼala, nke na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ibu,
ọ bụladị nʼelu nwa ịnyịnya ibu, nwa ịnyịnya na-ebu ibu. 10Ọ ga-ewezuga ụgbọ ịnyịnya niile nke Ifrem,
na ịnyịnya agha niile nke Jerusalem;
a ga-agbajikwa ụta agha.
Ọ ga-ewetara mba niile udo,
ọchịchị ya ga-esite nʼotu oke osimiri ruo nʼosimiri nke ọzọ,
sitekwa nʼOsimiri Yufretis ruo na nsọtụ niile nke ụwa. 11Ma gị onwe gị kwa, aga m eme ka ndị a tụrụ mkpọrọ nʼolulu nke mmiri na-adịghị nwere onwe ha,
nʼihi ọbara nke ọgbụgba ndụ ahụ mụ na unu gbara. 12Lọghachinụ nʼebe unu niile e wusiri ike, unu bụ ndị mkpọrọ nwere olileanya.
Ọ bụladị taa, ana m ekwupụta ya na m ga-eme ka unu lọta, gọziekwa unu okpukpu abụọ. 13Aga m agbagọ Juda dịka m si ekwe ụta m,
tinye Ifrem dịka àkụ.
Aga m akwali ụmụ gị ndị ikom, gị Zayọn,
ka ha megide ụmụ ndị ikom ndị Griis.
Aga m eme gị ka ị dịrị ka mma agha dị nʼaka dike nʼagha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.