Native Bible

Zechariah 8:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Okwu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ruru m ntị na-asị,

Zechariah 8:18 in English

Zechariah 8:18 · Berean Standard Bible

Then the word of the LORD of Hosts came to me, saying,

Context

16Ihe ndị a ka unu ga-eme: Kwuonụ eziokwu nye ibe unu, kpeenụ ikpe eziokwu nʼụlọikpe unu, nke a na-eweta udo. 17Unu echela echiche ọjọọ megide ibe unu; unu ahụla ịṅụ iyi ụgha nʼanya. Ihe ndị a niile ka m kpọrọ asị,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 18Okwu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ruru m ntị na-asị, 19Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu: “Ibu ọnụ unu na-ebu nʼọnwa nke anọ, ọnwa nke ise, ọnwa nke asaa na nʼọnwa nke iri ga-aghọrọ unu oge ịṅụrị ọṅụ na oge obi ụtọ. Ha ga-abụrụ Juda mmemme obi ụtọ. Nʼihi ya, hụnụ eziokwu na udo nʼanya.” 20Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwukwa: “Ndị dị iche iche na ndị bi nʼọtụtụ obodo dị iche iche ka ga-abịa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.