Zekaraya 8:20
Zechariah 8:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwukwa: “Ndị dị iche iche na ndị bi nʼọtụtụ obodo dị iche iche ka ga-abịa.
Zechariah 8:20 in English
Zechariah 8:20 · Berean Standard Bible
This is what the LORD of Hosts says: “Peoples will yet come—the residents of many cities—
Context
18Okwu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ruru m ntị na-asị, 19Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu: “Ibu ọnụ unu na-ebu nʼọnwa nke anọ, ọnwa nke ise, ọnwa nke asaa na nʼọnwa nke iri ga-aghọrọ unu oge ịṅụrị ọṅụ na oge obi ụtọ. Ha ga-abụrụ Juda mmemme obi ụtọ. Nʼihi ya, hụnụ eziokwu na udo nʼanya.” 20Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwukwa: “Ndị dị iche iche na ndị bi nʼọtụtụ obodo dị iche iche ka ga-abịa. 21Ndị bi nʼotu obodo ga-ejekwa nʼobodo ọzọ, sị, ‘Ka anyị jee na-atụfughị oge gaa rịọọ Onyenwe anyị arịrịọ, ka anyị chọọnụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. Mụ onwe m na-ejekwa.’ 22Ọtụtụ ndị mmadụ na ọtụtụ mba dị ike ga-abịa Jerusalem ịchọ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na ịrịọ ya arịrịọ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.