Native Bible

Zechariah 5:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, eleliri m anya hụ ụmụ nwanyị abụọ ọzọ, ndị ikuku na-efe nku ha. Ha nwere nku dịka nku ụgbala. Ha buliri nkata ahụ elu nʼetiti eluigwe na ala.

Zechariah 5:9 in English

Zechariah 5:9 · Berean Standard Bible

Then I lifted up my eyes and saw two women approaching, with the wind in their wings. Their wings were like those of a stork, and they lifted up the basket between heaven and earth.

Context

7Ngwangwa, e kpughepụrụ okwuchi nkata ahụ, ma lee, ahụrụ m otu nwanyị nọdụrụ ọdụ nʼime ya. 8Ọ sịrị, “Nke a bụ ajọ omume.” O nughachiri ya azụ nʼime nkata ahụ werekwa okwuchi nkata ahụ kpuchie ya. 9Mgbe ahụ, eleliri m anya hụ ụmụ nwanyị abụọ ọzọ, ndị ikuku na-efe nku ha. Ha nwere nku dịka nku ụgbala. Ha buliri nkata ahụ elu nʼetiti eluigwe na ala. 10Ajụrụ m mmụọ ozi ahụ na-agwa m okwu, “Ebee ka ha bu nkata ahụ na-aga?” 11Ọ gwara m, “Ha bu ya na-aga Babilọn* ebe ha ga-ewuru ya ụlọ. Mgbe ha wuchara ụlọ ahụ, ha ga-adọba nkata ahụ nʼelu ihe ndọkwasị.” 5:6 Maọbụ, ihe ọtụtụ Efa. 5:11 Ya bụ, Shaịna

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.