Zekaraya 5:7
Zechariah 5:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ngwangwa, e kpughepụrụ okwuchi nkata ahụ, ma lee, ahụrụ m otu nwanyị nọdụrụ ọdụ nʼime ya.
Zechariah 5:7 in English
Zechariah 5:7 · Berean Standard Bible
And behold, the cover of lead was raised, and there was a woman sitting inside the basket.
Context
5Mgbe ahụ, mmụọ ozi ahụ na-agwa m okwu bịakwutere m sị, “Lelie anya gị elu hụrụ ihe na-aga ịpụta ìhè.” 6Asịrị m, “Gịnị ka ọ bụ?”
Ọ sịrị, “Ọ bụ nkata.”* O kwukwara, “Nke a bụ mmehie nke ndị niile bi nʼala a.” 7Ngwangwa, e kpughepụrụ okwuchi nkata ahụ, ma lee, ahụrụ m otu nwanyị nọdụrụ ọdụ nʼime ya. 8Ọ sịrị, “Nke a bụ ajọ omume.” O nughachiri ya azụ nʼime nkata ahụ werekwa okwuchi nkata ahụ kpuchie ya. 9Mgbe ahụ, eleliri m anya hụ ụmụ nwanyị abụọ ọzọ, ndị ikuku na-efe nku ha. Ha nwere nku dịka nku ụgbala. Ha buliri nkata ahụ elu nʼetiti eluigwe na ala.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.