Native Bible

Zechariah 5:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Asịrị m, “Gịnị ka ọ bụ?” Ọ sịrị, “Ọ bụ nkata.”* O kwukwara, “Nke a bụ mmehie nke ndị niile bi nʼala a.”

Zechariah 5:6 in English

Zechariah 5:6 · Berean Standard Bible

“What is it?” I asked. And he replied, “A measuring basket * is going forth.” Then he continued, “This is their iniquity * in all the land.”

Context

4Ezipụla m ya, otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri, ‘Ọ ga-abanye nʼụlọ onye ọ bụla na-ezu ohi, na nʼụlọ ndị ji aha m na-aṅụ iyi ụgha. Ọ ga-anọgide nʼụlọ ahụ mebie ya kpamkpam. Ọ ga-emebi osisi na nkume niile e ji wuo ụlọ ahụ.’ ” 5Mgbe ahụ, mmụọ ozi ahụ na-agwa m okwu bịakwutere m sị, “Lelie anya gị elu hụrụ ihe na-aga ịpụta ìhè.” 6Asịrị m, “Gịnị ka ọ bụ?” Ọ sịrị, “Ọ bụ nkata.”* O kwukwara, “Nke a bụ mmehie nke ndị niile bi nʼala a.” 7Ngwangwa, e kpughepụrụ okwuchi nkata ahụ, ma lee, ahụrụ m otu nwanyị nọdụrụ ọdụ nʼime ya. 8Ọ sịrị, “Nke a bụ ajọ omume.” O nughachiri ya azụ nʼime nkata ahụ werekwa okwuchi nkata ahụ kpuchie ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.