Zekaraya 11:15
Zechariah 11:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara m, “Chịrịkwa ngwa ọrụ nke onye ọzụzụ atụrụ nzuzu ahụ,
Zechariah 11:15 in English
Zechariah 11:15 · Berean Standard Bible
And the LORD said to me: “Take up once more the equipment of a foolish shepherd.
Context
13Onyenwe anyị gwara m, “Tụpụrụ ya ọkpụ ite,” bụ ọnụahịa magburu onwe ya bụ nke ha rụrụ nʼisi m. Ya mere, eweere m iri ọlaọcha atọ ahụ tụpụrụ ya ọkpụ ite nʼụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị. 14Mgbe ahụ, agbajiri m mkpanaka m nke abụọ a na-akpọ Ịdị nʼotu, izipụta na njikọta maọbụ ịdị nʼotu dị nʼetiti Juda na Izrel adịghịkwa. 15Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara m, “Chịrịkwa ngwa ọrụ nke onye ọzụzụ atụrụ nzuzu ahụ, 16nʼihi na ana m aga ịkpọlite otu onye ọzụzụ atụrụ nke na-agaghị elekọta ụmụ atụrụ furu efu, maọbụ chọọ ndị na-etolite, maọbụ gwọọ ndị merụrụ ahụ, maọbụ nye ndị ahụ dị ike nri. Kama ọ ga-eri anụ atụrụ ndị ahụ ahụ ha dị mma, nyakapụkwa ụkwụ ha niile. 17“Ahụhụ dịrị onye ọzụzụ atụrụ ahụ na-abaghị uru,
nke na-adịghị elezi igwe ewu na atụrụ ya anya.
Ka mma agha gbupụ ya otu aka, ghụpụkwa ya anya aka nri ya.
Ka ogwe aka ya kpọnwụọkwa kpamkpam.
Otu a, anya aka nri ya ga-akpọkwa.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.