Zekaraya 10:11
Zechariah 10:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha ga-esi nʼosimiri nsogbu gafee. A ga-emekwa ka mmali elu nke osimiri dajụọ. Ebe obibi niile nke osimiri Naịl ga-atakọrọkwa. A ga-egbuda mpako niile nke Asịrịa, wezugakwa mkpara ọchịchị nke ndị Ijipt.
Zechariah 10:11 in English
Zechariah 10:11 · Berean Standard Bible
They will pass through the sea of distress and strike the waves of the sea; all the depths of the Nile will dry up. The pride of Assyria will be brought down, and the scepter of Egypt will depart.
Context
9A sịkwarị na m chụsara ha nʼetiti ndị dị iche iche,
ma ha ga-echeta m site nʼala niile ahụ dị anya.
Ha na ụmụ ha ga-adịkwa ndụ;
ha ga-alọtakwa. 10Aga m esi nʼala Ijipt kpọlata ha,
sitekwa nʼAsịrịa chịkọtaa ha.
Aga m akpọta ha na Gilead na Lebanọn.
Ha agaghị enwekwa ebe ga-ezuru ha niile. 11Ha ga-esi nʼosimiri nsogbu gafee.
A ga-emekwa ka mmali elu nke osimiri dajụọ.
Ebe obibi niile nke osimiri Naịl ga-atakọrọkwa.
A ga-egbuda mpako niile nke Asịrịa,
wezugakwa mkpara ọchịchị nke ndị Ijipt. 12Aga m eme ka ha dị ike nʼime Onyenwe anyị,
ọ bụkwa nʼaha ya ka ha ga na-ejegharị nʼudo.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
10:3 Ọ bụ mkpi na-ebuta ụzọ mgbe ha na-aga nʼigwe.
10:4 Maọbụ, nkume nkuku ụlọ
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.