Native Bible

Song of Songs 1:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye m hụrụ dị m ka ụda máá* e kechiri nʼakpa nke dị nʼetiti ara m abụọ.

Song of Songs 1:13 in English

Song of Songs 1:13 · Berean Standard Bible

My beloved is to me a sachet of myrrh resting between my breasts.

Context

11Anyị ga-emere gị ọlantị dị iche iche nke ọlaedo, nke e ji ọlaọcha chọọ mma. 12Mgbe eze nọ na tebul ya, mmanụ isi ọma m tere sijuru ebe niile. 13Onye m hụrụ dị m ka ụda máá* e kechiri nʼakpa nke dị nʼetiti ara m abụọ. 14Onye m hụrụ nʼanya dịrị m ka ụyọkọ ukwu okoko henna* nke sitere nʼogige ubi vaịnị En-Gedi.* 15Nʼezie, ị mara mma, onye m hụrụ nʼanya. Leenụ ka ị si maa mma! Anya gị dịka nduru.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.