Abụ nke Abụ 1:15
Song of Songs 1:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼezie, ị mara mma, onye m hụrụ nʼanya. Leenụ ka ị si maa mma! Anya gị dịka nduru.
Song of Songs 1:15 in English
Song of Songs 1:15 · Berean Standard Bible
How beautiful you are, my darling! Oh, how very beautiful! Your eyes are like doves.
Context
13Onye m hụrụ dị m ka ụda máá* e kechiri nʼakpa
nke dị nʼetiti ara m abụọ. 14Onye m hụrụ nʼanya dịrị m ka ụyọkọ ukwu okoko henna*
nke sitere nʼogige ubi vaịnị En-Gedi.* 15Nʼezie, ị mara mma, onye m hụrụ nʼanya.
Leenụ ka ị si maa mma!
Anya gị dịka nduru. 16Onye m hụrụ nʼanya, ị mara mma nwoke.
E, ị mara mma.
Ebe ndina anyị dịka ahịhịa ndụ. 17Ogidi nke ụlọ anyị bụ osisi sida,
ntuhie ya bụkwa osisi fịa.
1:5 Ndị Keda bụ otu ebo nʼetiti ndị Arab, obodo ha dị na ndịda ọdịda anyanwụ Edọm. Ha na-ebi nʼụlọ ikwu e ji ajị ewu ojii wuo
1:13 Ụda máá bụ eso e ji eme ihe otite na-esi isi ụtọ. A na-ewepụta eso ndị a nʼosisi Balsam nke na-eto nʼobodo Kush, nʼetiti ọwụwa anyanwụ nakwa India.
1:14 Okoko osisi henna bụ ahịhịa isi ọma a na-eji emepụta senti.
1:14 Bụ odo mmiri dị nʼọdịda osimiri nwụrụ anwụ. Ọtụtụ osisi nke a na-esi na ha enweta eso na-esi isi ọma, jupụtara nʼebe ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.