Rut 4:17
Ruth 4:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị inyom ndị agbataobi ya sịrị, “Ugbu a, nʼikpeazụ, Naomi enwetala nwa nwoke ọzọ!” Ha gụrụ ya Obed. Ọ bụkwa onye ahụ bụ nna Jesi, onye bụ nna Devid.
Ruth 4:17 in English
Ruth 4:17 · Berean Standard Bible
The neighbor women said, “A son has been born to Naomi,” and they named him Obed. He became the father of Jesse, the father of David.
Context
15Ya wetakwara gị ntute na ndụ gị ma bụrụkwa onye ga-azụ gị nʼisi awọ gị. Nʼihi na nwunye nwa gị, onye hụrụ gị nʼanya, onye baara gị uru karịa ndị ikom asaa, amụọrala gị nwa nwoke.” 16Naomi kuuru nwantakịrị ahụ, jikụọ ya nʼapata ya, lekọtaa ya. 17Ndị inyom ndị agbataobi ya sịrị, “Ugbu a, nʼikpeazụ, Naomi enwetala nwa nwoke ọzọ!” Ha gụrụ ya Obed. Ọ bụkwa onye ahụ bụ nna Jesi, onye bụ nna Devid. 18Nke a bụ usoro ndị a mụrụ site na Perez.
Perez mụrụ Hezrọn 19Hezrọn mụrụ Ram
Ram mụrụ Aminadab
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.