Native Bible

Ruth 1:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma Elimelek di Naomi nwụrụ, hapụ naanị Naomi, na ụmụ ya ndị ikom abụọ.

Ruth 1:3 in English

Ruth 1:3 · Berean Standard Bible

Then Naomi’s husband Elimelech died, and she was left with her two sons,

Context

1Nʼoge ndị ahụ, mgbe ndị ikpe na-achị, oke ụnwụ dara nʼala Izrel. Nʼihi ụnwụ a, otu nwoke, onye Betlehem, obodo dị na Juda, kwakọọrọ ihe ya niile, duru nwunye ya, na ụmụ ya ndị ikom abụọ, hapụ obodo ya gaa biri dịka ọbịa nʼala Moab. 2Aha nwoke a bụ Elimelek. Aha nwunye ya bụ Naomi, ma aha ụmụ ya ndị ikom abụọ bụ Mahlọn na Kilịọn. Ha bụ ndị Efrat* si Betlehem nke dị na Juda. Ha bịarutere nʼala Moab biri nʼebe ahụ. 3Ma Elimelek di Naomi nwụrụ, hapụ naanị Naomi, na ụmụ ya ndị ikom abụọ. 4Ha lụrụ ndị nwunye site nʼetiti ndị inyom Moab. Aha nke mbụ bụ Ọpa, ebe aha nke abụọ bụ Rut. Ha biri nʼebe ahụ ihe dị ka afọ iri. 5Mahlọn na Kilịọn mechara nwụọ. Ya mere, Naomi ghọrọ onye gba aka di, na onye gba aka ụmụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.