Native Bible

Ruth 1:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha lụrụ ndị nwunye site nʼetiti ndị inyom Moab. Aha nke mbụ bụ Ọpa, ebe aha nke abụọ bụ Rut. Ha biri nʼebe ahụ ihe dị ka afọ iri.

Ruth 1:4 in English

Ruth 1:4 · Berean Standard Bible

who took Moabite women as their wives, one named Orpah and the other named Ruth. And after they had lived in Moab about ten years,

Context

2Aha nwoke a bụ Elimelek. Aha nwunye ya bụ Naomi, ma aha ụmụ ya ndị ikom abụọ bụ Mahlọn na Kilịọn. Ha bụ ndị Efrat* si Betlehem nke dị na Juda. Ha bịarutere nʼala Moab biri nʼebe ahụ. 3Ma Elimelek di Naomi nwụrụ, hapụ naanị Naomi, na ụmụ ya ndị ikom abụọ. 4Ha lụrụ ndị nwunye site nʼetiti ndị inyom Moab. Aha nke mbụ bụ Ọpa, ebe aha nke abụọ bụ Rut. Ha biri nʼebe ahụ ihe dị ka afọ iri. 5Mahlọn na Kilịọn mechara nwụọ. Ya mere, Naomi ghọrọ onye gba aka di, na onye gba aka ụmụ. 6Mgbe Naomi nọ nʼala Moab nụ na Onyenwe anyị eletala ndị Izrel site nʼinye ha ihe oriri, Naomi na ndị nwunye ụmụ ya abụọ kwadoro ịlaghachi azụ nʼala Izrel.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.