Ndị Rom 12:14
Romans 12:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gọzienụ ndị na-akpagbu unu, gọzienụ ha, unu abụkwala ha ọnụ.
Romans 12:14 in English
Romans 12:14 · Berean Standard Bible
Bless those who persecute you. Bless and do not curse.
Context
12Nweenụ obi aṅụrị nʼime olileanya, nweenụ ntachiobi nʼime nsogbu, na-ekpekwanụ ekpere mgbe niile. 13Na enyetụnụ ụfọdụ ndị nsọ* ihe site nʼihe unu nwere iji gboo mkpa dịrị ha. Na-elekọtakwanụ ndị ọbịa anya nke ọma. 14Gọzienụ ndị na-akpagbu unu, gọzienụ ha, unu abụkwala ha ọnụ. 15Mgbe ndị ọzọ na-aṅụrị ọṅụ, soronụ ha ṅụrịa ọṅụ. Mgbe ha nọ nʼiru ụjụ, soronụ ha ruo ụjụ. 16Na-ebinụ nʼudo. A bụla onye mpako, unu na ndị ọnọdụ ha dị ala na-enwe mmekọrịta, echekwala na ị maara ihe niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.