Native Bible

Romans 12:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Na enyetụnụ ụfọdụ ndị nsọ* ihe site nʼihe unu nwere iji gboo mkpa dịrị ha. Na-elekọtakwanụ ndị ọbịa anya nke ọma.

Romans 12:13 in English

Romans 12:13 · Berean Standard Bible

Share with the saints who are in need. Practice hospitality.

Context

11Unu abụla ndị umengwụ nʼọrụ unu. Kama werenụ mmụọ na obi na-anụ ọkụ na-ejere Onyenwe anyị ozi mgbe niile. 12Nweenụ obi aṅụrị nʼime olileanya, nweenụ ntachiobi nʼime nsogbu, na-ekpekwanụ ekpere mgbe niile. 13Na enyetụnụ ụfọdụ ndị nsọ* ihe site nʼihe unu nwere iji gboo mkpa dịrị ha. Na-elekọtakwanụ ndị ọbịa anya nke ọma. 14Gọzienụ ndị na-akpagbu unu, gọzienụ ha, unu abụkwala ha ọnụ. 15Mgbe ndị ọzọ na-aṅụrị ọṅụ, soronụ ha ṅụrịa ọṅụ. Mgbe ha nọ nʼiru ụjụ, soronụ ha ruo ụjụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.