Ndị Rom 11:28
Romans 11:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihe banyere oziọma, ha bụ ndị iro nke Chineke nʼihi unu. Ma a bịa nʼihe gbasara nhọpụta, ha bụ ndị nke a hụrụ nʼanya nʼihi ndị nna nna ha.
Romans 11:28 in English
Romans 11:28 · Berean Standard Bible
Regarding the gospel, they are enemies on your account; but regarding election, they are loved on account of the patriarchs.
Context
26Mgbe ahụ, a ga-azọpụta Izrel niile. Dịka e dere ya,
“Onye nzọpụta ga-esite na Zayọn bịa.
Ọ ga-eme ka Jekọb site na ndụ asọpụrụghị Chineke chigharịa. 27Nke a bụ ọgbụgba ndụ m nke dị nʼetiti mụ na ha,
mgbe m wepụrụ mmehie ha niile.”* 28Nʼihe banyere oziọma, ha bụ ndị iro nke Chineke nʼihi unu. Ma a bịa nʼihe gbasara nhọpụta, ha bụ ndị nke a hụrụ nʼanya nʼihi ndị nna nna ha. 29Nʼihi na enye anarakwa adịghị nʼonyinye nakwa ọkpụkpọ Chineke. 30Unu onwe unu ndị na-enupuru Chineke isi na mbụ, anatala ebere ya ugbu a, nʼihi nnupu isi ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.