Ndị Rom 11:26
Romans 11:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, a ga-azọpụta Izrel niile. Dịka e dere ya, “Onye nzọpụta ga-esite na Zayọn bịa. Ọ ga-eme ka Jekọb site na ndụ asọpụrụghị Chineke chigharịa.
Romans 11:26 in English
Romans 11:26 · Berean Standard Bible
And so all Israel will be saved, as it is written: “The Deliverer will come from Zion; He will remove godlessness from Jacob.
Context
24Nʼihi na asị na e gbupụtara unu site nʼalaka osisi oliv ọhịa, nyapagide unu nʼosisi oliv ọma ahụ nʼụzọ na-abụghị usoro ndụ, gịnị kwanụ ga-egbochi ịnabata alaka ndị ya, bụ ndị si na ya, mee ka ha laghachi azụ nʼosisi oliv ahụ e si nyakapụ ha. 25Ụmụnna m, achọrọ m ka unu mata ihe omimi a, ka unu ghara ịnya isi. Nnupu isi ụfọdụ ụmụ Izrel agaghị adịgide kama ọ ga-adị ruo nʼoge ọnụọgụgụ ndị mba ọzọ a ga-anabata zuru. 26Mgbe ahụ, a ga-azọpụta Izrel niile. Dịka e dere ya,
“Onye nzọpụta ga-esite na Zayọn bịa.
Ọ ga-eme ka Jekọb site na ndụ asọpụrụghị Chineke chigharịa. 27Nke a bụ ọgbụgba ndụ m nke dị nʼetiti mụ na ha,
mgbe m wepụrụ mmehie ha niile.”* 28Nʼihe banyere oziọma, ha bụ ndị iro nke Chineke nʼihi unu. Ma a bịa nʼihe gbasara nhọpụta, ha bụ ndị nke a hụrụ nʼanya nʼihi ndị nna nna ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.