Mkpughe 20:7
Revelation 20:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe puku afọ ahụ gafesịrị, a ga-emekwa ka ekwensu si nʼụlọ mkpọrọ ya pụta.
Revelation 20:7 in English
Revelation 20:7 · Berean Standard Bible
When the thousand years are complete, Satan will be released from his prison,
Context
5Nke a bụ mbilite nʼọnwụ nke mbụ. Ndị fọdụrụ nʼetiti ndị nwụrụ anwụ esoghị bilite nʼọnwụ tutu ruo mgbe puku afọ gafesịrị. 6Ndị a gọziri agọzi na ndị dị nsọ bụ ndị ahụ ketara oke na mbilite nʼọnwụ nke mbụ ahụ. Ọnwụ nke abụọ enweghị ike nʼebe ha nọ, nʼihi na ha ga-abụ ndị nchụaja Chineke na nke Kraịst, sorokwa ya chịa ọchịchị puku afọ. 7Mgbe puku afọ ahụ gafesịrị, a ga-emekwa ka ekwensu si nʼụlọ mkpọrọ ya pụta. 8Ọ ga-apụkwa jegharịa iduhie mba niile nọ nʼakụkụ anọ nke ụwa, ya bụ Gog na Magog, ọ ga-akpọkọta ha maka agha. Ọnụọgụgụ ha dịka aja dị nʼikpere osimiri. 9Ha biliri agha guzo nʼụwa niile, gbaa ụlọ ikwu nke ndị nsọ Chineke hụrụ nʼanya gburugburu. Ma ọkụ sitere nʼeluigwe gbadata repịa ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.